23 O wee mee Jọshụa nwa Nọn+ onye ndú, wee sị: “Nwee obi ike, dịkwa ike,+ n’ihi na ọ bụ gị ga-akpọba ụmụ Izrel n’ala ahụ m ṅụụrụ ha iyi inye ha,+ mụ onwe m ga-anọnyekwara gị.”
5 Ọ dịghị onye ga-eguzosi ike n’ihu gị ụbọchị niile nke ndụ gị.+ M ga-anọnyere gị dị nnọọ ka m nọnyeere Mozis.+ Agaghị m agbahapụ gị, agaghịkwa m ahapụ gị ma ọlị.+
10 Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị.+ Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị.+ M ga-eme ka ị dị ike.+ M ga-enyere gị aka.+ M ga-eji aka nri m+ nke ezi omume+ jidesie gị ike.’