Jeremaya 2:26 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 26 “Dị ka ihere si eme onye ohi mgbe e jidere ya, otú ahụ ka ihere meworo ndị ụlọ Izrel,+ ha onwe ha, ndị eze ha, ndị isi ha na ndị nchụàjà ha na ndị amụma ha.+ Matiu 6:20 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 Kama nke ahụ, na-akpakọbaranụ onwe unu akụ̀ n’eluigwe,+ ebe nla ma ọ bụ nchara na-adịghị erichapụ ihe,+ ebe ndị ohi na-adịghịkwa awaba zuo ohi. Matiu 24:43 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 43 “Ma maranụ otu ihe, na a sị na onyeisi ezinụlọ maara oge nche nke onye ohi ji abịa,+ ọ gaara amụrụ anya ma ghara ikwe ka a waba n’ụlọ ya.
26 “Dị ka ihere si eme onye ohi mgbe e jidere ya, otú ahụ ka ihere meworo ndị ụlọ Izrel,+ ha onwe ha, ndị eze ha, ndị isi ha na ndị nchụàjà ha na ndị amụma ha.+
20 Kama nke ahụ, na-akpakọbaranụ onwe unu akụ̀ n’eluigwe,+ ebe nla ma ọ bụ nchara na-adịghị erichapụ ihe,+ ebe ndị ohi na-adịghịkwa awaba zuo ohi.
43 “Ma maranụ otu ihe, na a sị na onyeisi ezinụlọ maara oge nche nke onye ohi ji abịa,+ ọ gaara amụrụ anya ma ghara ikwe ka a waba n’ụlọ ya.