Nehemaya 8:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Ha wee chọpụta na e dere n’iwu ahụ Jehova nyere site n’aka Mozis+ na ụmụ Izrel ga-ebi n’ụlọ ndò+ n’oge ememme a nke a na-eme n’ọnwa nke asaa,+ Nehemaya 8:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 Mmadụ niile wee gaa gbute ihe ndị ahụ, wuokwara onwe ha ụlọ ndò, onye nke ọ bụla n’elu ụlọ+ ya nakwa n’ogige ha nakwa n’ogige+ ụlọ nke ezi Chineke nakwa n’ámá+ Ọnụ Ụzọ Ámá Mmiri+ nakwa n’ámá Ọnụ Ụzọ Ámá Ifrem.+ Nehemaya 8:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 Ọgbakọ ahụ dum nke ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta wee wuo ụlọ ndò, wee biri n’ụlọ ndò; n’ihi na ụmụ Izrel emetụbeghị otú ahụ malite n’oge Jọshụa nwa Nọn+ ruo n’ụbọchị ahụ, ha wee na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu.+
14 Ha wee chọpụta na e dere n’iwu ahụ Jehova nyere site n’aka Mozis+ na ụmụ Izrel ga-ebi n’ụlọ ndò+ n’oge ememme a nke a na-eme n’ọnwa nke asaa,+
16 Mmadụ niile wee gaa gbute ihe ndị ahụ, wuokwara onwe ha ụlọ ndò, onye nke ọ bụla n’elu ụlọ+ ya nakwa n’ogige ha nakwa n’ogige+ ụlọ nke ezi Chineke nakwa n’ámá+ Ọnụ Ụzọ Ámá Mmiri+ nakwa n’ámá Ọnụ Ụzọ Ámá Ifrem.+
17 Ọgbakọ ahụ dum nke ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta wee wuo ụlọ ndò, wee biri n’ụlọ ndò; n’ihi na ụmụ Izrel emetụbeghị otú ahụ malite n’oge Jọshụa nwa Nọn+ ruo n’ụbọchị ahụ, ha wee na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu.+