27 Ị ga-edokwa obi anụ+ àjà ahụ a na-efegharị efegharị nsọ nakwa ụkwụ anụ nke òkè ahụ dị nsọ bụ́ nke e fegharịrị nakwa nke e nyere n’onyinye site n’ebule ahụ e ji ahọpụta mmadụ,+ site n’ihe bụ́ maka Erọn na ihe bụ́ maka ụmụ ya ndị ikom.
35 “‘Ọ bụ nke a bụ òkè Erọn dị ka onye nchụàjà nakwa òkè ụmụ ya dị ka ndị nchụàjà site n’àjà a na-esure n’ọkụ nye Jehova, n’ụbọchị ọ kpọtara+ ha nso ijere Jehova ozi dị ka ndị nchụàjà,