Ọpụpụ 22:31 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 31 “Unu ga-abụrụ m ndị dị nsọ;+ unu erila anụ dị n’ọhịa nke anụ ọhịa dọgburu adọgbu.+ Unu ga-atụpụrụ ya nkịta.+ Levitikọs 20:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 “‘Unu ga-edo onwe unu nsọ wee bụrụ ndị dị nsọ,+ n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu. Levitikọs 20:26 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 26 Unu ga-abụrụ m ndị dị nsọ,+ n’ihi na mụ onwe m bụ́ Jehova dị nsọ;+ m ga-esi n’etiti ndị dị iche iche kewapụta unu ka unu bụrụ nke m.+ Ọnụ Ọgụgụ 15:40 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 40 Ihe mere unu ga-eji mee ya bụ ka unu na-echeta ihe niile m nyere n’iwu ma na-eme ha, bụrụkwa ndị dị nsọ nye Chineke unu.+ Diuterọnọmi 7:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 N’ihi na unu bụ ndị dị nsọ nye Jehova bụ́ Chineke unu.+ Ọ bụ unu ka Jehova bụ́ Chineke unu họọrọ ịbụ ndị ya, bụ́ ihe onwunwe pụrụ iche, n’etiti ndị niile nọ n’elu ala.+
31 “Unu ga-abụrụ m ndị dị nsọ;+ unu erila anụ dị n’ọhịa nke anụ ọhịa dọgburu adọgbu.+ Unu ga-atụpụrụ ya nkịta.+
26 Unu ga-abụrụ m ndị dị nsọ,+ n’ihi na mụ onwe m bụ́ Jehova dị nsọ;+ m ga-esi n’etiti ndị dị iche iche kewapụta unu ka unu bụrụ nke m.+
40 Ihe mere unu ga-eji mee ya bụ ka unu na-echeta ihe niile m nyere n’iwu ma na-eme ha, bụrụkwa ndị dị nsọ nye Chineke unu.+
6 N’ihi na unu bụ ndị dị nsọ nye Jehova bụ́ Chineke unu.+ Ọ bụ unu ka Jehova bụ́ Chineke unu họọrọ ịbụ ndị ya, bụ́ ihe onwunwe pụrụ iche, n’etiti ndị niile nọ n’elu ala.+