2“‘Ọ bụrụ na mkpụrụ obi achọọ ịchụrụ Jehova àjà ọka,*+ àjà ya kwesịrị ịbụ ntụ ọka e gwere nke ọma;+ ọ ga-awụkwa ya mmanụ ma tụkwasị frankinsens n’elu ya.
10 “N’ụbọchị nke asatọ,+ ọ ga-akpụrụ ụmụ ebule abụọ ahụ́ dị mma na otu nne atụrụ,+ nke na-agafebeghị otu afọ, kporokwa ụzọ atọ n’ime ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka* e gwere nke ọma ka ọ bụrụ àjà ọka+ nke a gwara mmanụ na otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ lọg mmanụ;+
4 onye na-eweta onyinye ya ga-ewetakwara Jehova àjà ọka* bụ́ ntụ ọka e gwere nke ọma,+ ya bụ, otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa, nke a gwara otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ hin mmanụ.