24 Ọ bụ ya mere m ji sị unu:+ “Unu onwe unu ga-enweta ala ha, mụ onwe m ga-enyekwa ya unu ka ọ bụrụ nke unu, bụ́ ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, onye si n’etiti ndị dị iche iche kewapụta unu.”+
53 N’ihi na gị onwe gị kewapụtara ha ka ha bụrụ ihe nketa gị n’ime ndị niile nke ụwa,+ dị nnọọ ka i kwuru site n’ọnụ Mozis+ bụ́ ohu gị mgbe i si n’Ijipt na-akpọpụta ndị nna nna anyị, gị Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova.”
8 Heman wee gwa Eze Ahazuirọs, sị: “E nwere otu ndị gbasara+ ebe niile, ndị nọpụkwara iche n’etiti ndị niile n’ógbè niile ị na-achị;+ iwu ha dị iche na nke ndị niile ọzọ, ha adịghịkwa edebe iwu eze,+ o kwesịghịkwa ekwesị ka eze hapụ ha.