24 Akpọrọla chi ha isiala, ekwekwala ka a rata gị ife ha ofufe, emekwala ihe ọ bụla ga-eyi ihe niile ha rụrụ,+ kama ị ghaghị ịkwatu ha, ị ghaghịkwa ịkụtu ogidi+ nsọ ha.
5 “N’aka nke ọzọ, nke a bụ ihe unu ga-eme ha: Unu ga-akwatusị ebe ịchụàjà ha,+ unu ga-akụtusịkwa ogidi nsọ ha,+ unu ga-akwatusịkwa+ ogwe osisi ha dị nsọ,+ unu ga-akpọkwa ihe oyiyi ha a pịrị apị ọkụ.+
3 Unu ga-akwatukwa ebe ịchụàjà+ ha ma kụrisịa ogidi nsọ ha,+ unu ga-akpọkwa ogwe osisi ha dị nsọ ọkụ+ ma kwatusịa ihe oyiyi a pịrị apị+ nke chi ha, unu ga-ekpochapụkwa aha ha n’ebe ahụ.+