8 M na-agbada ịga napụta ha n’aka ndị Ijipt+ nakwa ịkpọpụta ha n’ala ahụ kpọga ha n’ala dị mma, dịkwa obosara, n’ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,+ n’ógbè ndị Kenan na ndị Het na ndị Amọraịt na ndị Perizaịt na ndị Haịvaịt nakwa ndị Jibọs.+
23 N’ihi na mmụọ ozi m ga-ebutere gị ụzọ, n’ezie, ọ ga-akpọbata gị n’ala ndị Amọraịt na nke ndị Het na nke ndị Perizaịt na nke ndị Kenan, ndị Haịvaịt na ndị Jibọs, m ga-ekpochapụkwa ha.+