15 “Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-asachicha ebe nsọ+ ahụ na arịa+ niile nke ebe nsọ ahụ mgbe ụmụ Izrel na-akwali, e mesịa, ụmụ ndị ikom Kohat ga-abata iburu ha,+ ma ha agaghị emetụ+ ebe nsọ ahụ aka ka ha ghara ịnwụ. Ihe ndị a bụ ibu ụmụ Kohat ga na-ebu n’ụlọikwuu nzute.+
31 Nke a bụ ọrụ dịịrị ha, ya bụ, ihe ha ga na-ebu,+ dị ka ozi niile ha ga na-eje n’ụlọikwuu nzute si dị: awara osisi+ nke ụlọikwuu ahụ na osisi ntụhie+ ya na ogidi+ ya na ntọala ya ndị nwere oghere,+