21 Jehova wee nụ ísì ụtọ,+ Jehova wee sị n’obi ya:+ “Agaghị m akọcha ala ọzọ+ n’ihi mmadụ, n’ihi na ọchịchọ+ obi mmadụ jọrọ njọ malite n’oge ọ bụ nwata gawa;+ ọ dịghịkwa mgbe m ga-eti ihe niile dị ndụ ihe otiti dị nnọọ ka m mere.+
9 A ga-eji mmiri saa eriri afọ ya+ na ụkwụ ya; onye nchụàjà ga-esurekwa ha niile n’ọkụ n’elu ebe ịchụàjà dị ka àjà nsure ọkụ, bụ́ àjà na-esi ísì ụtọ nke a na-esurere Jehova n’ọkụ.+
41 Ihe unu ga-atọ m ụtọ n’ihi ihe ahụ na-esi ísì ụtọ.+ M ga-eme nke a mgbe m ga-akpọpụta unu n’etiti ndị dị iche iche, sikwa n’ala dị iche iche a chụsasịrị unu kpọkọta unu.+ A ga-esikwa n’aka unu doo m nsọ n’ihu mba dị iche iche.’+