21 Ihe ndị na-esonụ bụ ihe e ji rụọ ụlọikwuu ahụ, bụ́ ụlọikwuu Ihe Àmà,+ bụ́ ihe ndị Mozis nyere iwu ka a gụkọta, dị ka ọrụ ndị Livaị+ nke Ịtama+ nwa Erọn onye nchụàjà duziri.
2 Kpọrọkwa ụmụnne gị ndị si n’ebo Livaị, bụ́ ọnụmara nna gị, bịa nso, ka ha sonyere gị wee na-ejere gị ozi,+ na-ejere ma gị onwe gị ma ụmụ gị ozi, n’ihu ụlọikwuu Ihe Àmà.+