19 N’ihi na amarawo m ya ka o wee nye ụmụ ya nakwa ezinụlọ ya ga-anọchi ya iwu ka ha debe ụzọ Jehova iji na-eme ezi omume ma na-eme ihe n’ikpe ziri ezi;+ ka Jehova wee mezuoro Ebreham ihe o kwuru banyere ya.”+
19 Eluigwe na ụwa bụ ndị akaebe m megide unu taa,+ na edebewo m ndụ na ọnwụ n’ihu unu,+ ngọzi+ na nkọcha;+ ị ga-ahọrọkwa ndụ ka i wee dịrị ndụ,+ gị na ụmụ gị,+