23 ozu ya agaghị adị n’elu osisi abalị dum;+ kama ị ga-ahụ na e liri ya n’ụbọchị ahụ, n’ihi na ihe a bụrụ ọnụ n’ebe Chineke nọ ka onye a kwụwara n’osisi bụ;+ emerụkwala ala gị, nke Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị ka ọ bụrụ ihe nketa gị.+
29 O wee kwụwa eze E-aị+ n’elu osisi ruo ná mgbede;+ mgbe anyanwụ na-achọ ịda, Jọshụa nyere iwu, ha wee butuo ozu+ ya n’osisi ahụ wee busa ya n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ ma tụkọta nkume dị ukwuu n’elu ya, ruo taa.