29 N’ala ịkpa a ka ozu unu ga-atọgbọrọ,+ ee, unu ndị tamuru ntamu megide m,+ ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime unu malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe.
65 N’ihi na Jehova kwuru banyere ha, sị: “Ha aghaghị ịnwụ n’ala ịkpa a.”+ Ya mere, ọ dịghị nwoke ọ bụla fọdụrụ n’ime ha ma e wezụga Keleb nwa Jefọne na Jọshụa nwa Nọn.+