13 Ọ ga-erukwa na ozugbo ọbụ ụkwụ ndị nchụàjà, ndị bu igbe Jehova, bụ́ Onyenwe ụwa dum, zọsara mmiri Jọdan, a ga-egbochi mmiri Jọdan, bụ́ mmiri nke si n’ebe mgbago na-asọdata, ọ ga-eguzokwa otu ebe dị ka mmiri e gbochiri egbochi.”+
16 mmiri nke na-esi n’ebe mgbago asọdata wee guzoro otu ebe. O toro dị ka mmiri e gbochiri egbochi+ ruo n’Adam bụ́ ebe dị anya, bụ́ obodo dị n’akụkụ Zaretan,+ ebe nke na-asọga n’oké osimiri Araba, bụ́ Oké Osimiri Nnu,+ takọrọ. E gbochiri ya, ụmụ Izrel wee si n’ihu Jeriko gafee.