3 Seraị, nwunye Ebram, wee kpọrọ Hega, nwaanyị na-ejere ya ozi bụ́ onye Ijipt, kpọnye Ebram di ya ka ọ bụrụ nwunye ya,+ mgbe afọ iri Ebram biwere n’ala Kenan gwụchara.
8 Ọ bụrụ na ihe ya adịghị nna ya ukwu mma nke mere na o jighị ya mere iko nwaanyị,+ kama nke ahụ, o wee mee ka onye ọzọ gbara ya, ọ gaghị enwe ikike iresị ya ndị mba ọzọ n’ihi na ọ ghọrọ nwaanyị ahụ aghụghọ.
13 N’oge ahụ, Devid gara n’ihu inwetakwu ndị iko+ na ndị nwunye+ site na Jeruselem mgbe o si Hibrọn lọta; e wee na-amụkwuru Devid ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.
21 Rehoboam hụrụ Meaka nwa nwa Absalọm n’anya karịa ndị nwunye ya niile ọzọ+ na ndị iko ya; n’ihi na ọ lụrụ ụmụ nwaanyị iri na asatọ, nweekwa ndị iko iri isii, nke mere na ọ mụrụ ụmụ nwoke iri abụọ na asatọ na ụmụ nwaanyị iri isii.