23 N’ihi na mmụọ ozi m ga-ebutere gị ụzọ, n’ezie, ọ ga-akpọbata gị n’ala ndị Amọraịt na nke ndị Het na nke ndị Perizaịt na nke ndị Kenan, ndị Haịvaịt na ndị Jibọs, m ga-ekpochapụkwa ha.+
2Mmụọ ozi+ Jehova wee si na Gilgal+ gbagoo Bokim+ wee sị: “M kpọpụtara unu n’Ijipt ma kpọbata unu n’ala m ṅụụrụ nna nna unu hà iyi inye ha.+ M sịkwara, ‘Agaghị m emebi ọgbụgba ndụ mụ na unu ma ọlị.+