25 O wee na-ahịọpụsị ụkwụ ụgbọ ịnyịnya ha nke mere na ọ nọ na-esiri ha ike ịgba ya;+ ndị Ijipt wee malite ikwu, sị: “Ka anyị si n’ebe ndị Izrel nọ gbapụ, n’ihi na Jehova na-alụso ndị Ijipt ọgụ n’ihi ha.”+
7 Ozugbo ahụ, ha biliri gbaa ọsọ mgbe chi jiri+ wee hapụ ụlọikwuu ha na ịnyịnya+ ha na ịnyịnya ibu ha—ebe ahụ ha mara ụlọikwuu dị nnọọ otú ahụ ọ dị—ha wee na-agba ọsọ maka mkpụrụ obi ha.+