14 Unu ga-anọ n’ebe dị ọcha rie obi anụ àjà ahụ a na-efegharị efegharị+ na ụkwụ anụ nke bụ́ òkè dị nsọ,+ gị na ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom,+ n’ihi na e nyewo ha ka ha bụrụ òkè gị na òkè ụmụ gị ga na-eketa n’àjà udo nke ụmụ Izrel.
9 Nke a ga-abụ nke gị n’ime ihe ndị kasị nsọ, n’ime àjà a na-esure n’ọkụ, onyinye ha ọ bụla, ya na àjà ọka+ ha ọ bụla na àjà mmehie+ ha ọ bụla na àjà ikpe ọmụma+ ha ọ bụla, bụ́ ndị ha ga na-ewetara m. Ọ ga-abụrụ gị na ụmụ gị ihe kasị nsọ.