11 Biko, nara onyinye m wetara iji gọzie gị,+ n’ihi na Chineke egosiwo m ihu ọma, n’ihi na enwekwara m ihe niile.”+ O wee na-arịọsi ya ike, nke mere na ọ naara ya.+
15 O wee laghachikwuru onye nke ezi Chineke,+ ya na ndị niile so ya, wee bịa guzoro n’ihu ya, sị: “Lee, amatawo m ugbu a na e nweghị Chineke n’ebe ọ bụla n’ụwa ma e wezụga n’Izrel.+ Ugbu a, biko, nara ohu gị onyinye m wetara iji gọzie+ gị.”
35 Egosiwo m unu n’ihe niile na site n’ịdọgbu onwe unu n’ọrụ+ otú a, unu aghaghị inyere ndị na-adịghị ike aka,+ unu aghaghịkwa iburu okwu Onyenwe anyị Jizọs n’uche, mgbe ya onwe ya sịrị, ‘A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe+ karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.’”