10 Ebe ndịda bụ nke Ifrem, ebe ugwu abụrụ nke Manase, oké osimiri wee bụrụ ókè ya;+ n’ebe ugwu, Manase ruru Asha, n’ebe ọwụwa anyanwụ, Manase ruru Ịsaka.
16 Ụmụ Josef wee sị: “Ógbè ahụ bụ́ ugwu ugwu agaghị ezuru anyị, ndị Kenan, bụ́ ndị bi n’ala ahụ nke dị na ndagwurugwu, nwere ụgbọ ịnyịnya agha+ ndị nwere mma, tinyere ndị bi na Bet-shian+ na obodo nta ya niile nakwa ndị bi na ndagwurugwu Jezril.”+