6 Mmụọ Jehova wee malite ịkpa ike n’ahụ́ ya,+ o wee dọwaa ya abụọ, dị nnọọ ka mmadụ si adọwa nwa mkpi, o jighịkwa ihe ọ bụla n’aka. Ọ gwaghịkwa nna ya na nne ya ihe o mere.
20 Ma, ọ bụ Benaya,+ nwa Jehoyada,+ nwa otu nwoke bụ́ dike, onye mere ọtụtụ ihe na Kabzil,+ gburu ụmụ ndị ikom abụọ nke Ariel onye Moab; ọ bụkwa ya gbadara wee gbuo ọdụm+ n’ime olulu mmiri n’ụbọchị snoo na-ada.+