14 Ugbu a, alaeze gị agaghị adịte aka.+ Jehova ga-achọtara onwe ya nwoke obi ya nabatara;+ Jehova ga-ahọpụtakwa ya ịbụ onye ndú+ nke ndị ya, n’ihi na i debeghị ihe Jehova nyere gị n’iwu.”+
16N’ikpeazụ, Jehova gwara Samuel, sị: “Ruo ole mgbe ka ị ga na-eruru Sọl uju,+ ebe ọ bụ na mụ onwe m ajụwo ya ka ọ ghara ịbụkwa eze Izrel?+ Gbajuo mpi gị mmanụ+ gawa. M ga-edunye gị ka ị gakwuru Jesi+ onye Betlehem, n’ihi na esiwo m n’etiti ụmụ ya ndị ikom họtara onwe m eze.”+
13 Samuel wee were mpi mmanụ+ ahụ tee ya mmanụ n’etiti ụmụnne ya. Mmụọ Jehova wee malite ịkpa ike n’ahụ́ Devid malite n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu.+ E mesịa, Samuel biliri laa Rema.+
22 Mgbe o wepụsịrị ya,+ o mere ka Devid bụrụ eze ha,+ bụ́ onye ọ gbara àmà banyere ya, sị, ‘Ahọrọwo m Devid nwa Jesi,+ nwoke obi m nabatara,+ onye ga-eme ihe niile m na-achọ.’+