2 Samuel 11:25 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 25 Devid wee sị onye ozi ahụ: “Nke a bụ ihe ị ga-agwa Joab, ‘Ka ihe a ghara ịdị njọ n’anya gị, n’ihi na mma agha na-eri+ otu onye dị ka ọ na-eri onye ọzọ. Lụsosie obodo ahụ agha ike, kwatuokwa ya.’+ Gbaakwa ya ume.” 1 Ihe E Mere 20:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 O wee ruo ná mmalite afọ,+ n’oge ndị eze na-eji aga agha,+ na Joab duuru ìgwè ndị agha+ gaa bibie ala ụmụ Amọn, bịakwa nọchibido Raba,+ ma Devid nọ na Jeruselem; Joab wee merie+ Raba, kwadakwa ya.
25 Devid wee sị onye ozi ahụ: “Nke a bụ ihe ị ga-agwa Joab, ‘Ka ihe a ghara ịdị njọ n’anya gị, n’ihi na mma agha na-eri+ otu onye dị ka ọ na-eri onye ọzọ. Lụsosie obodo ahụ agha ike, kwatuokwa ya.’+ Gbaakwa ya ume.”
20 O wee ruo ná mmalite afọ,+ n’oge ndị eze na-eji aga agha,+ na Joab duuru ìgwè ndị agha+ gaa bibie ala ụmụ Amọn, bịakwa nọchibido Raba,+ ma Devid nọ na Jeruselem; Joab wee merie+ Raba, kwadakwa ya.