Abụ Ọma 18:21 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 21 N’ihi na edebewo m ụzọ Jehova,+Emeghịkwa m omume ọjọọ nke bụ́ ịhapụ Chineke m.+ Abụ Ọma 71:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 Chineke, ị nọwo na-ezi m ihe malite n’oge m bụ nwata,+Ruo ugbu a, anọ m na-akọ banyere ọrụ gị dị ebube.+ Ilu 8:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Ịtụ egwu Jehova pụtara ịkpọ ihe ọjọọ asị.+ Ibuli onwe onye elu na nganga+ na ụzọ ọjọọ na ọnụ na-ekwu ihe rụrụ arụ+ ka m kpọrọ asị. Ekliziastis 7:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Ọ ka mma ka i jidesie nke a ike, ma ewepụkwala aka na nke ọzọ;+ n’ihi na onye na-atụ egwu Chineke ga-alafere site n’ịgbaso ha niile.+ Ekliziastis 12:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 Cheta Onye Okike Ukwu+ gị n’oge ị bụ okorobịa,+ tupu oge ọdachi erute,+ ma ọ bụ tupu afọ ndị ahụ erute, mgbe ị ga-asị: “Ha adịghị atọ m ụtọ”;+ Aịzaya 50:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Ònye n’ime unu na-atụ egwu+ Jehova wee na-ege ohu ya ntị.+ Ònye jeworo ije n’ọchịchịrị,+ onye na-enweghịkwa ìhè? Ya tụkwasị obi n’aha Jehova,+ daberekwa na Chineke ya.+
17 Chineke, ị nọwo na-ezi m ihe malite n’oge m bụ nwata,+Ruo ugbu a, anọ m na-akọ banyere ọrụ gị dị ebube.+
13 Ịtụ egwu Jehova pụtara ịkpọ ihe ọjọọ asị.+ Ibuli onwe onye elu na nganga+ na ụzọ ọjọọ na ọnụ na-ekwu ihe rụrụ arụ+ ka m kpọrọ asị.
18 Ọ ka mma ka i jidesie nke a ike, ma ewepụkwala aka na nke ọzọ;+ n’ihi na onye na-atụ egwu Chineke ga-alafere site n’ịgbaso ha niile.+
12 Cheta Onye Okike Ukwu+ gị n’oge ị bụ okorobịa,+ tupu oge ọdachi erute,+ ma ọ bụ tupu afọ ndị ahụ erute, mgbe ị ga-asị: “Ha adịghị atọ m ụtọ”;+
10 Ònye n’ime unu na-atụ egwu+ Jehova wee na-ege ohu ya ntị.+ Ònye jeworo ije n’ọchịchịrị,+ onye na-enweghịkwa ìhè? Ya tụkwasị obi n’aha Jehova,+ daberekwa na Chineke ya.+