5 N’ihi na ha na-achịrị anụ ụlọ ha, burukwa ụlọikwuu ha gbagote. Ha na-abịa n’ìgwè dị ka igurube,+ ha na kamel ha enweghị ngụta;+ ha na-abatakwa n’ala ahụ iji bibie ya.+
5 Ma ndị Filistia zukọtara ibuso Izrel agha, ya bụ, ụgbọ ịnyịnya+ agha ndị dị iri atọ na puku mmadụ isii ndị na-agba ịnyịnya nakwa ndị dị ọtụtụ dị ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri;+ ha wee gbagoo malite ịma ụlọikwuu na Mikmash n’ebe ọwụwa anyanwụ Bet-even.+
34 bụrụ ndị ọkụ na-emeghị ihe ọ bụla,+ gbanahụ ihu mma agha,+ bụrụ ndị e mere ka ha dị ike mgbe ha na-adịghị ike,+ bụrụ ndị dike n’agha,+ mee ka ụsụụ ndị agha ndị mba ọzọ gbaa ọsọ.+