15 O wee gaa n’ihu ịsị: “Gị onwe gị maara na ọchịchị gaara abụ nke m, ọ bụkwa m ka Izrel dum lekwasịrị anya ka m bụrụ eze;+ ma ọchịchị tụgharịrị wee ghọọ nke nwanne m nwoke, n’ihi na ọ bụ Jehova mere ka ọ ghọọ nke ya.+
24 Ma dị nnọọ ka Jehova dị ndụ,+ bụ́ onye mere ka m guzosie ike,+ meekwa ka m nọkwasị n’ocheeze Devid nna m+ nakwa onye wuuru m ụlọ+ dị nnọọ ka o kwuru,+ taa a ga-egbu Adọnaịja.”+
29Devid bụ́ eze wee gwa ọgbakọ+ ahụ dum, sị: “Sọlọmọn nwa m, onye Chineke m họọrọ,+ bụ obere nwa,+ isi akabeghịkwa ya, ma ọrụ a dị ukwuu; n’ihi na nnukwu ụlọ a abụghị maka mmadụ,+ kama ọ bụ maka Jehova Chineke.