24 Ya mere, ọ chụpụrụ mmadụ ahụ ma mee ka ndị cherọb+ nọrọ n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ogige Iden,+ debekwa mma agha nke ihu ya na-egbukepụ ọkụ, nke nọ na-echigharị onwe ya iji na-eche ụzọ e si abanye n’ebe osisi nke ndụ ahụ dị nche.
27 O wee debe cherọb ndị ahụ n’ime ụlọ dị n’ime, nke na ha gbasapụrụ nku cherọb ndị ahụ.+ Ya mere, nku nke otu cherọb ruru n’otu mgbidi, nku cherọb nke ọzọ ruru ná mgbidi nke ọzọ; nku ha dịkwa n’ebe etiti ụlọ ahụ, otu na-emetụ na nke ọzọ.+
18 nakwa banyere ebe ịchụàjà nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ+ nke a ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha mee dị ka ịdị arọ ya kwesịrị ịdị, nakwa banyere ihe nnọchianya ụgbọ ịnyịnya,+ ya bụ, cherọb+ ọlaedo ndị nku ha ga-agbasapụ agbasapụ wee kpuchie igbe ọgbụgba ndụ Jehova.