Abụ Ọma 51:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Lee! Ebu m njehie pụta mgbe a mụpụtara m site n’ihe mgbu,+Abụ m onye mmehie malite mgbe nne m tụụrụ ime m.+ Abụ Ọma 130:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 A sị na ọ bụ njehie ka ị na-ele,+ Jaa,Jehova, ònye pụrụ iguzo?+ Abụ Ọma 143:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 Emela ka gị na ohu gị baa n’ikpe;+N’ihi na ọ dịghị onye dị ndụ nke pụrụ ịbụ onye ezi omume n’ihu gị.+ Ilu 20:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Ònye pụrụ ịsị: “Emewo m ka obi m dị ọcha;+ adịwo m ọcha wee ghara inwe mmehie”?+ Ekliziastis 7:20 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 N’ihi na e nweghị onye ezi omume n’ụwa nke na-eme naanị ezi ihe, nke na-adịghịkwa emehie.+ Aịzaya 53:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 Anyị niile awagharịwo dị ka atụrụ;+ onye ọ bụla n’ime anyị gawara n’ụzọ nke ya; Jehova emewokwa ka onye ahụ buru njehie anyị niile.+ Ndị Rom 3:23 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 23 N’ihi na mmadụ niile emehiewo,+ ha adịghịkwa eru ebube Chineke,+ Ndị Galeshia 3:22 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 22 Ma Akwụkwọ Nsọ+ kpọchikọrọ ihe niile n’okpuru mmehie,+ ka ndị na-enwe okwukwe wee nweta nkwa ahụ nke na-esite n’okwukwe e nwere n’ebe Jizọs Kraịst nọ.+ 1 Jọn 1:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 Ọ bụrụ na anyị asị: “Anyị enweghị mmehie,”+ anyị na-eduhie onwe anyị,+ eziokwu adịghịkwa n’ime anyị.
5 Lee! Ebu m njehie pụta mgbe a mụpụtara m site n’ihe mgbu,+Abụ m onye mmehie malite mgbe nne m tụụrụ ime m.+
2 Emela ka gị na ohu gị baa n’ikpe;+N’ihi na ọ dịghị onye dị ndụ nke pụrụ ịbụ onye ezi omume n’ihu gị.+
6 Anyị niile awagharịwo dị ka atụrụ;+ onye ọ bụla n’ime anyị gawara n’ụzọ nke ya; Jehova emewokwa ka onye ahụ buru njehie anyị niile.+
22 Ma Akwụkwọ Nsọ+ kpọchikọrọ ihe niile n’okpuru mmehie,+ ka ndị na-enwe okwukwe wee nweta nkwa ahụ nke na-esite n’okwukwe e nwere n’ebe Jizọs Kraịst nọ.+
8 Ọ bụrụ na anyị asị: “Anyị enweghị mmehie,”+ anyị na-eduhie onwe anyị,+ eziokwu adịghịkwa n’ime anyị.