Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ olu ụtọ Devid. Oge Netan onye amụma bịakwutere ya mgbe ya na Bat-shiba+ nwesịrị mmekọahụ.
51 Chineke, biko, meere m amara dị ka obiọma gị si dị.+
Hichapụ mmebi iwu m dị ka ebere gị si dị ukwuu.+
2 Sachaa m nke ọma ka njehie m pụọ n’ahụ́ m,+
Sachapụ m mmehie m.+
3 N’ihi na mụ onwe m maara mmebi iwu m,+
Mmehie m dịkwa n’ihu m mgbe niile.+
4 Ọ bụ gị, naanị gị, ka m mehieworo,+
Ọ bụkwa ihe dị njọ n’anya gị ka m meworo;+
Ya mere, ị bụ onye ezi omume mgbe i kwuru okwu,+
O nweghịkwa ihe a ga-eji taa gị ụta mgbe i kpere ikpe.+
5 Lee! Ebu m njehie pụta mgbe a mụpụtara m site n’ihe mgbu,+
Abụ m onye mmehie malite mgbe nne m tụụrụ ime m.+
6 Lee! Eziokwu nke dị n’ime obi mmadụ na-atọ gị ụtọ;+
Meekwa ka m mata amamihe n’ime obi m.+
7 Jiri hisop sachapụ m mmehie, ka m wee dị ọcha;+
Sachaa m, ka m wee na-acha ọcha karịa snoo.+
8 Mee ka m ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ,+
Ka ọkpụkpụ ndị i gwepịara wee ṅụrịa ọṅụ.+
9 Wepụ ihu gị ná mmehie m,+
Hichapụkwa njehie m niile.+
10 Chineke, biko, mee ka m nwee obi dị ọcha,+
Tinyekwa mmụọ ọhụrụ, nke iguzosi ike, n’ime m.+
11 Achụpụla m n’ihu gị;+
Biko, anapụkwala m mmụọ nsọ gị.+
12 Mee ka m nwetaghachi ọṅụ nke nzọpụta si n’aka gị,+
Kwadokwa m site n’ime ka m nwee mmụọ ime ihe.+
13 M ga-akụziri ndị na-emebi iwu ụzọ gị,+
Ka ndị mmehie wee laghachikwute gị.+
14 Chineke bụ́ Chineke nke nzọpụta m,+ biko, napụta m n’ikpe ọmụma ọbara,+
Ka ire m wee jiri ọṅụ na-akọ banyere ezi omume gị.+
15 Jehova, biko, meghee egbugbere ọnụ m ndị a,+
Ka ọnụ m wee kwupụta otuto gị.+
16 N’ihi na ịchụrụ gị àjà adịghị atọ gị ụtọ—ma ọ́ bụghị ya, m gaara achụ ya;+
Àjà a na-esurecha n’ọkụ adịghị atọ gị ụtọ.+
17 Àjà a na-achụrụ Chineke bụ mmụọ nke nwere mwute;+
Chineke, ị gaghị eleghara obi tiwara etiwa, nke nọ ná mwute, anya.+
18 Jiri amara gị meere Zayọn ihe ọma;+
Biko, wughachi mgbidi Jeruselem.+
19 Mgbe ahụ, àjà a chụrụ n’ezi omume ga-atọ gị ụtọ,+
Àjà nsure ọkụ na àjà a na-esurecha n’ọkụ;+
Mgbe ahụ, a ga-eji ọtụtụ oké ehi chụọ àjà n’elu ebe ịchụàjà gị.+