33 Ma m ga-achụsasị unu ná mba dị iche iche,+ m ga-amịpụtakwa mma agha n’ọbọ ka ọ chụwa unu;+ ala unu ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu,+ obodo unu dị iche iche ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ n’efu.
11 Onye ga-akpọ nnụnụ na-eri anụ ka o si n’ebe ọwụwa anyanwụ bịa,+ kpọọkwa onye ga-emezu ihe m kpebiri ka o si n’ala dị anya bịa.+ Ekwuwo m ya; m ga-emekwa ka o mezuo.+ Akpụwo m ya, m ga-emekwa ya.+