10 O wee ruo ná mmalite+ afọ na Eze Nebukadneza zipụrụ+ ndị ikom ya ka ha kpụta ya Babịlọn+ ma bute arịa ndị mara mma dị n’ụlọ Jehova.+ O mekwara Zedekaya+ nwanne nna ya eze Juda nakwa Jeruselem.+
24Mgbe Nebukadreza bụ́ eze Babịlọn si na Jeruselem dọrọ Jekonaya+ nwa Jehoyakim+ bụ́ eze Juda n’agha, tinyere ndị isi Juda na ndị omenkà+ na ndị na-ewu mgbidi siri ike, wee kpụrụ ha laa Babịlọn,+ Jehova gosiri m nkata abụọ mkpụrụ fig dị n’ime ha, ndị a dọsara n’ihu ụlọ nsọ Jehova.
12 “Biko, gwa ụlọ ahụ na-enupụ isi,+ sị, ‘Ọ̀ bụ na unu amaghị ihe ihe ndị a pụtara?’ Gwa ha, sị, ‘Lee! Eze Babịlọn bịara Jeruselem wee kpụrụ eze ya+ na ndị isi ya kpụga Babịlọn bụ́ ebe ya onwe ya nọ.+