12 E mesịa, Jehoyakin eze Juda nyefere onwe ya n’aka eze Babịlọn,+ ya na nne ya+ na ndị na-ejere ya ozi na ndị o mere ndị isi na ndị na-eje ozi n’obí ya; eze Babịlọn wee kpụrụ ya laa n’afọ nke asatọ+ nke ọchịchị ya.
6 onye e si na Jeruselem dọrọ n’agha,+ ya na ndị a dọtara n’agha bụ́ ndị a dọọrọ ha na Jekonaya+ bụ́ eze Juda n’agha, onye Nebukadneza+ eze Babịlọn dọọrọ n’agha.
9 N’ikpeazụ, ha ji nko dọrọ ya dọba n’ime ngịga wee buru ya butere eze Babịlọn.+ Ha wee jiri ụgbụ e ji achụ nta bute ya, ka a ghara ịnụ olu ya ọzọ n’ugwu niile dị n’Izrel.+