10 O wee ruo ná mmalite+ afọ na Eze Nebukadneza zipụrụ+ ndị ikom ya ka ha kpụta ya Babịlọn+ ma bute arịa ndị mara mma dị n’ụlọ Jehova.+ O mekwara Zedekaya+ nwanne nna ya eze Juda nakwa Jeruselem.+
6 onye e si na Jeruselem dọrọ n’agha,+ ya na ndị a dọtara n’agha bụ́ ndị a dọọrọ ha na Jekonaya+ bụ́ eze Juda n’agha, onye Nebukadneza+ eze Babịlọn dọọrọ n’agha.