16 Ma ndị dike niile, ndị dị puku asaa, na ndị omenkà na ndị na-ewu mgbidi siri ike, ndị dị otu puku, ndị dike niile na-ebu agha, ka eze Babịlọn kpụụrụ ka ha bụrụ ndị a dọọrọ n’agha laa Babịlọn.+
12 Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ndị nna anyị kpasuru Chineke nke eluigwe iwe,+ o nyefere+ ha n’aka Nebukadneza+ eze Babịlọn, onye Kaldia,+ ọ kwadakwara ụlọ a+ wee dọrọ ndị anyị n’agha laa Babịlọn.+
24Mgbe Nebukadreza bụ́ eze Babịlọn si na Jeruselem dọrọ Jekonaya+ nwa Jehoyakim+ bụ́ eze Juda n’agha, tinyere ndị isi Juda na ndị omenkà+ na ndị na-ewu mgbidi siri ike, wee kpụrụ ha laa Babịlọn,+ Jehova gosiri m nkata abụọ mkpụrụ fig dị n’ime ha, ndị a dọsara n’ihu ụlọ nsọ Jehova.
20 bụ́ ndị Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn na-eburughị mgbe o si na Jeruselem dọrọ Jekonaya+ nwa Jehoyakim, bụ́ eze Juda, na ndị niile a ma ama na Juda nakwa na Jeruselem, n’agha laa Babịlọn;+
2 mgbe Jekonaya+ bụ́ eze si na Jeruselem pụọ, ya na nwunye eze+ na ndị na-eje ozi n’obí eze, ndị isi Juda na Jeruselem,+ na ndị omenkà na ndị na-ewu mgbidi siri ike.+