5 Otu nwoke bụ́ Neaman,+ onyeisi ndị agha eze Siria, bụ onye ukwu n’ihu onyenwe ya, bụrụkwa onye a na-akwanyere ùgwù, n’ihi na ọ bụ site n’aka ya ka Jehova mere ka Siria nweta nzọpụta;+ nwoke ahụ bụkwa dimkpa, bụrụkwa dike, ọ bụ ezie na ọ bụ onye ekpenta.