29 Jehoram+ bụ́ eze wee lọta Jezril+ ka a gwọọ ya ahụ́ ahụ ndị Siria merụrụ ya n’ime Rema mgbe o busoro Hazel eze Siria agha. Ma Ehazaya+ nwa Jehoram eze Juda gbadara Jezril ịga hụ Jehoram nwa Ehab, n’ihi na ọ na-arịa ọrịa.
21 Jehoram wee sị: “Kwadebe ụgbọ ịnyịnya m!”+ E wee kwadebe ụgbọ ịnyịnya agha ya, Jehoram eze Izrel na Ehazaya+ eze Juda wee pụwa, onye nke ọ bụla nọ n’ụgbọ ịnyịnya agha ya. Ka ha nọ na-aga izute Jihu, ha hụrụ ya n’ibé ala Nebọt+ onye Jezril.
22Ndị bi na Jeruselem wee mee Ehazaya+ bụ́ ọdụdụ nwa ya eze n’ọnọdụ ya, (n’ihi na ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga ha na ndị Arab+ so bịa n’ebe ha mara ụlọikwuu gburu ndị niile tọrọ ya,)+ Ehazaya nwa Jehoram wee malite ịchị dị ka eze Juda.