2 Ndị Eze
8 Ịlaịsha gwara nwaanyị ahụ o mere ka nwa ya dị ndụ ọzọ,+ sị: “Bilie, gị na ezinụlọ gị, gaa biri dị ka ọbịa n’ebe ọ bụla ị pụrụ ibi dị ka ọbịa;+ n’ihi na Jehova ekwuwo na ụnwụ ga-ada,+ ọ bụghị naanị nke ahụ, ọ ga-adị n’ala a ruo afọ asaa.”+ 2 Nwaanyị ahụ wee bilie mee ihe onye nke ezi Chineke kwuru,+ ya na ezinụlọ ya,+ ha wee biri dị ka ọbịa n’ala ndị Filistia+ ruo afọ asaa.
3 O wee ruo mgbe afọ asaa gwụrụ na nwaanyị ahụ si n’ala ndị Filistia lọta ma gaa itiku eze+ maka ụlọ ya na ubi ya. 4 Eze nọkwa na-agwa Gehezaị+ bụ́ onye na-ejere onye nke ezi Chineke ozi, sị: “Biko, kọọrọ m oké ihe niile Ịlaịsha mere.”+ 5 O wee ruo na mgbe ọ nọ na-akọrọ eze otú o si mee ka onye nwụrụ anwụ dị ndụ,+ lee, nwaanyị ahụ o mere ka nwa ya dị ndụ ọzọ nọ na-etiku eze maka ụlọ ya na ubi ya.+ Gehezaị sịrị ozugbo: “Onyenwe m eze,+ lee nwaanyị ahụ, leekwa nwa ya ahụ Ịlaịsha mere ka ọ dị ndụ ọzọ.” 6 Eze wee jụọ nwaanyị ahụ, o wee kọọrọ ya akụkọ ahụ.+ Eze wee kpọnye ya onye na-eje ozi n’obí ya,+ sị: “Nyeghachi ya ihe niile bụ́ nke ya na ihe niile si n’ubi ya malite n’ụbọchị ọ hapụrụ ala a ruo ugbu a.”+
7 Ịlaịsha wee bịa na Damaskọs;+ Ben-hedad+ eze Siria na-arịakwa ọrịa. E wee kọọrọ ya, sị: “Onye nke ezi Chineke+ abịarutela ebe a.” 8 Eze wee sị Hazel:+ “Were onyinye+ gakwuru onye nke ezi Chineke, jụọ Jehova ase+ site n’ọnụ ya, sị, “M̀ ga-agbake n’ọrịa a?’” 9 Hazel wee were onyinye gakwuru ya, ya bụ, ụdị ihe ọma niile dị na Damaskọs, ihe kamel iri anọ bu, o wee bịa guzo n’ihu ya, sị: “Nwa gị nwoke,+ Ben-hedad, eze Siria, dunyere m ka m bịakwute gị, sị, ‘M̀ ga-agbake n’ọrịa a?’” 10 Ịlaịsha wee sị ya: “Gaa sị ya, ‘Ị ga-agbake,’ ma Jehova egosiwo m+ na ọ ga-anwụrịrị.”+ 11 O wee legide ya anya, legide ya anya ruo mgbe ihere mewere ya. Onye nke ezi Chineke wee malite ịkwa ákwá.+ 12 Hazel wee jụọ ya, sị: “Gịnị mere onyenwe m ji na-akwa ákwá?” O wee zaa, sị: “N’ihi na amaara m nke ọma ihe ọjọọ+ ị ga-eme ụmụ Izrel. Ị ga-agba ebe ha e wusiri ike ọkụ, ị ga-ejikwa mma agha gbuo ndị ikom ha bụ́ dike, ị ga-akụrikwa+ ụmụntakịrị ha, ị ga-abọwakwa ndị inyom ha dị ime afọ.”+ 13 Hazel wee sị: “Gịnị ka ohu gị bụ́ nkịta+ efu bụ, nke na ọ pụrụ ime oké ihe a?” Ma Ịlaịsha sịrị: “Jehova egosiwo m na ị ga-abụ eze Siria.”+
14 E mesịa, o si n’ebe Ịlaịsha nọ pụọ wee bịakwute onyenwe ya, bụ́ onye jụrụ ya, sị: “Gịnị ka Ịlaịsha gwara gị?” O wee zaa, sị: “Ọ sịrị m, ‘Ị ghaghị ịgbake.’”+ 15 O wee ruo echi ya na ọ chịịrị ákwà ihe ndina, sụnye ya na mmiri ma were ya sachie ya ihu,+ o wee nwụọ.+ Hazel+ wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.
16 N’afọ nke ise nke ọchịchị Jehoram+ nwa Ehab bụ́ eze Izrel, mgbe Jehọshafat bụ eze Juda, Jehoram+ nwa Jehọshafat bụ́ eze Juda ghọrọ eze. 17 Ọ gbara afọ iri atọ na abụọ mgbe ọ ghọrọ eze, ọ chịkwara afọ asatọ na Jeruselem.+ 18 O wee na-eje ije n’ụzọ ndị eze Izrel+ jere, dị nnọọ ka ndị ụlọ Ehab mere;+ n’ihi na ọ bụ ada Ehab ka ọ lụrụ,+ ọ wee na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova. 19 Ma Jehova achọghị ịla Juda+ n’iyi n’ihi ohu ya bụ́ Devid,+ dị nnọọ ka o kwere ya nkwa inye ya na ụmụ ya oriọna+ mgbe niile.
20 N’ụbọchị ya ka Idọm+ nupụụrụ Juda isi wee meere onwe ha eze.+ 21 N’ihi ya, Jehoram gara Zea, ya na ụgbọ ịnyịnya ya niile. O wee bilie n’abalị gbuo ndị Idọm gbara ya na ndị isi ụgbọ ịnyịnya ya gburugburu; ndị ahụ wee gbalaa n’ụlọikwuu ha. 22 Ma Idọm nọgidere na-enupụrụ Juda isi ruo taa. Ọ bụkwa n’oge ahụ ka Libna+ malitere inupụ isi.
23 Ihe ndị ọzọ metụtara Jehoram na ihe niile o mere, ọ̀ bụ na e deghị ha n’akwụkwọ+ ihe ndị mere n’ụbọchị ndị eze Juda? 24 N’ikpeazụ, Jehoram sooro nna nna ya hà dinaa,+ e wee lie ya n’ebe e liri nna nna ya hà n’Obodo Devid.+ Ehazaya+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.
25 N’afọ nke iri na abụọ nke ọchịchị Jehoram nwa Ehab eze Izrel, Ehazaya nwa Jehoram eze Juda ghọrọ eze.+ 26 Ehazaya gbara afọ iri abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịchị, ọ chịkwara otu afọ na Jeruselem.+ Aha nne ya bụ Atalaya+ nwa nwa Ọmraị+ bụ́ eze Izrel. 27 O wee na-eje ije n’ụzọ ụlọ Ehab+ jere ma na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova,+ dị ka ụlọ Ehab mere, n’ihi na ya na ụlọ Ehab gọrọ ọgọ.+ 28 N’ihi ya, o sooro Jehoram nwa Ehab gaa buso Hazel+ eze Siria agha na Remọt-gilied,+ ma ndị Siria gbaturu+ Jehoram. 29 Jehoram+ bụ́ eze wee lọta Jezril+ ka a gwọọ ya ahụ́ ahụ ndị Siria merụrụ ya n’ime Rema mgbe o busoro Hazel eze Siria agha. Ma Ehazaya+ nwa Jehoram eze Juda gbadara Jezril ịga hụ Jehoram nwa Ehab, n’ihi na ọ na-arịa ọrịa.