2 “Gwa ụmụ Izrel, sị, ‘Onye ọ bụla n’ime ụmụ Izrel nakwa onye ọ bụla n’ime ndị mbịarambịa nke bi dị ka ọbịa n’Izrel, nke nyere Molek nwa ya ọ bụla,+ a ghaghị igbu ya. Ndị ala unu ga-eji nkume tụgbuo ya.
10 A gaghị ahụ n’etiti unu onye ọ bụla nke na-esure* nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’ọkụ,+ onye ọ bụla nke na-agba afa,+ onye na-eme anwansi+ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-achọ ihe mgbaàmà ọdịnihu+ ma ọ bụ dibịa anwansi,+
10 O wee mee ka a ghakwara ịnọ na Tofet,+ nke dị na ndagwurugwu ụmụ Hinọm,+ na-efe ofufe, ka onye ọ bụla ghara isurere* Molek+ nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’ọkụ.+
3 Ya onwe ya surekwara ihe nsure ọkụ+ na ndagwurugwu nwa Hinọm,+ sureekwa ụmụ ya ndị ikom+ n’ọkụ, dị ka ihe arụ+ nke mba ndị Jehova chụpụrụ n’ihu ụmụ Izrel mere si dị.+
6 O surekwara* ụmụ ya n’ọkụ+ na ndagwurugwu nwa Hinọm.+ O mekwara anwansi,+ gbaa afa+ ma mee mgbaasị,+ o mekwara ka e nwee ndị na-eme mgbaasị+ na ndị ọrụ ha bụ ịkọ ọdịnihu.+ O mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova nke ukwuu iji kpasuo ya iwe.+
5 ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’etiti osisi ukwu dị iche iche,+ n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ,+ ndị na-egbu ụmụaka n’iyi ndagwurugwu dị iche iche, n’ebe ndị gbawara agbawa na nkume dị elu?+
31 Ha ewuwo ebe ndị dị elu na Tofet,+ nke dị na ndagwurugwu nwa Hinọm,+ iji suree ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom n’ọkụ,+ nke bụ́ ihe m na-enyeghị n’iwu, ọ bataghịkwa m n’obi.’+
37 N’ihi na ha akwawo iko,+ ọbara dịkwa n’aka ha,+ ha na arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị akwawo iko.+ E wezụga nke ahụ, ha ewerewo ụmụ ha mụụrụ m sureere* arụsị ndị a n’ọkụ ka ha bụrụ nri ha.+