30 M ga-alakwa ebe ndị dị elu+ unu ndị dị nsọ n’iyi, gbupụsịakwa ihe unu ji adọba ihe nsure ọkụ unu na-esi ísì ụtọ ma mee ka ozu unu tọgbọrọ n’elu ozu arụsị unu ndị na-asọ oyi ka nsị;+ mkpụrụ obi m ga-akpọkwa unu asị.+
28 Ya mere, eze natara ndụmọdụ+ wee mee nwa ehi ọlaedo abụọ+ ma gwa ndị ahụ, sị: “Ọ bụ ihe siri ike nke ukwuu unu ịgbagowe Jeruselem. Lee Chineke gị,+ Izrel, nke kpọpụtara gị n’ala Ijipt.”+
26 O wee na-eme oké ihe arụ site n’iso arụsị dị iche iche na-asọ oyi ka nsị,+ dị ka ihe niile ndị Amọraịt mere si dị, bụ́ ndị Jehova chụpụrụ n’ihu ụmụ Izrel.’”+