7 Ma ụlọ ahụ, ka a nọ na-ewu ya, ọ bụ nkume a wacharala awa+ ka e ji wuo ya; a nụghịkwa ụda hama na anyụike ma ọ bụ ngwá ọrụ ọ bụla bụ́ ígwè n’ụlọ+ ahụ ka a na-ewu ya.
9 E ji nkume dị oké ọnụ+ wuo ha niile dị ka ọ̀tụ̀tụ̀ a chọrọ si dị, bụ́ nkume ndị a wapụtara awapụta, ndị e jikwa mma ịkwọ nkume kwọọ, n’ime nakwa ná mpụta, malite na ntọala ruo n’ebe o jedebere n’elu, nakwa ná mpụta ya ruo n’ogige ukwu ahụ.+