12“Ndị a bụ ụkpụrụ+ na mkpebi ikpe+ ndị unu ga-elezi anya ka unu debe+ n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke nke nna nna gị hà ga-eme ka i nweta, n’ụbọchị niile unu ga-adị ndụ n’ala ahụ.+
19 “Ọ ga-adị n’aka ya, ọ ga na-agụ ya n’ụbọchị niile nke ndụ ya,+ ka o wee mụta ịtụ egwu Jehova bụ́ Chineke ya iji debe ihe niile e kwuru n’iwu a nakwa ụkpụrụ ndị a site n’ime ha;+