3 Devid kwakọbakwara ígwè nke ukwuu maka ntu a ga-eji kụọ ibo ọnụ ụzọ ámá dị iche iche nakwa maka ihe e ji akpagide ihe, ọ kwakọbakwara ọla kọpa nke ukwuu nke na a pụghị ịtụ ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀,+
14 Lee, n’oge m nọ ná mmekpa ahụ́,+ m kwadebere otu narị puku talent ọlaedo+ na otu nde talent ọlaọcha maka ụlọ Jehova, a pụghịkwa ịtụ ọla kọpa+ na ígwè+ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ n’ihi na ha dị nnọọ ukwuu; m kwadebekwara osisi na nkume, ma ị ga-etinyekwu ihe na ha.
20 Ma ogidi abụọ ahụ,+ oké osimiri ahụ,+ oké ehi iri na abụọ ahụ e ji ọla kọpa kpụọ+ bụ́ ndị dị n’okpuru oké osimiri ahụ, ihe ndị e ji ebu ihe, bụ́ ndị Eze Sọlọmọn mere maka ụlọ Jehova,+ a tụghị ịdị arọ nke ọla kọpa e ji kpụọ ha niile atụ̀.+