30“Ahụhụ ga-adịrị ụmụ dị isi ike,”+ ka Jehova kwuru, “ndị dị njikere ime ihe ha zubere, ọ bụghị ihe m zubere;+ ndị dịkwa njikere ịwụsa àjà ihe ọṅụṅụ,* ma ọ bụghị mmụọ m ka ha ji na-eme ya, iji mee mmehie tụkwasị na nke ha mere eme;+
12 Ha mere ka obi ha+ dị ka nkume emụri ka ha ghara irube isi n’iwu+ nakwa n’okwu Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru site na mmụọ ya,+ site n’ọnụ ndị amụma oge mbụ;+ Jehova nke ụsụụ ndị agha wee wee oké iwe.”+
5 Ma dị ka ekweghị ekwe+ gị na obi gị nke na-enweghị nchegharị+ si dị, ị na-akpakọtara onwe gị ọnụma+ nke ga-abịakwasị gị n’ụbọchị ọnụma+ nakwa n’ụbọchị a ga-ekpughe+ ikpe ezi omume nke Chineke.+