Aịzaya 41:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 “Lee! Ihere ga-eme ndị niile na-eweso gị iwe, a ga-emechukwa ha ihu.+ Ndị na-esesa gị okwu ga-adị ka ihe efu, ha ga-alakwa n’iyi.+ Aịzaya 49:26 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 26 M ga-eme ka ndị na-emegbu gị rie anụ onwe ha; ọbara ha ga na-egbu ha dị ka mmanya dị ụtọ. Anụ ahụ́ niile ga-amarakwa na mụ onwe m, Jehova,+ bụ Onye Nzọpụta gị+ na Onye Mgbapụta gị,+ Dike nke Jekọb.”+ Maịka 6:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Esi m n’ala Ijipt kpọpụta unu,+ ọ bụkwa n’ụlọ ndị ohu ka m gbapụtara unu;+ m wee zitere unu Mozis, Erọn na Miriam.+
11 “Lee! Ihere ga-eme ndị niile na-eweso gị iwe, a ga-emechukwa ha ihu.+ Ndị na-esesa gị okwu ga-adị ka ihe efu, ha ga-alakwa n’iyi.+
26 M ga-eme ka ndị na-emegbu gị rie anụ onwe ha; ọbara ha ga na-egbu ha dị ka mmanya dị ụtọ. Anụ ahụ́ niile ga-amarakwa na mụ onwe m, Jehova,+ bụ Onye Nzọpụta gị+ na Onye Mgbapụta gị,+ Dike nke Jekọb.”+
4 Esi m n’ala Ijipt kpọpụta unu,+ ọ bụkwa n’ụlọ ndị ohu ka m gbapụtara unu;+ m wee zitere unu Mozis, Erọn na Miriam.+