Ọpụpụ 17:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 Ndị Izrel wee sesa Mozis okwu,+ sị: “Nye anyị mmiri ka anyị ṅụọ.” Ma Mozis sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-esesa m okwu? Gịnị mere unu ji na-ele Jehova ule?”+ Ọnụ Ọgụgụ 14:22 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 22 Ma ndị niile nọ na-ahụ ebube+ m na ihe ịrịba ama+ m mere n’Ijipt nakwa n’ala ịkpa ma nọrọ na-ele m ule+ ugboro iri a, gharakwa ige ntị n’olu m,+ Abụ Ọma 78:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Ha wee nwaa Chineke ọnwụnwa n’ime obi ha+Site n’ikwu ka e nye mkpụrụ obi ha ihe ọ ga-eri.+ 1 Ndị Kọrịnt 10:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Ka anyị gharakwa ile Jehova+ ule, dị ka ụfọdụ n’ime ha lere ya ule,+ agwọ wee laa ha n’iyi.+ Ndị Hibru 3:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 bụ́ ebe nna nna unu hà nọ nwaa m ọnwụnwa, leekwa m ule, ma ha hụrụ ọrụ m+ ruo afọ iri anọ.+
2 Ndị Izrel wee sesa Mozis okwu,+ sị: “Nye anyị mmiri ka anyị ṅụọ.” Ma Mozis sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-esesa m okwu? Gịnị mere unu ji na-ele Jehova ule?”+
22 Ma ndị niile nọ na-ahụ ebube+ m na ihe ịrịba ama+ m mere n’Ijipt nakwa n’ala ịkpa ma nọrọ na-ele m ule+ ugboro iri a, gharakwa ige ntị n’olu m,+