Job 22:27 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 27 Ị ga-arịọsi ya arịrịọ ike, ọ ga-anụkwa olu gị;+Ị ga-emezukwa ihe i kwere ná nkwa.+ Abụ Ọma 22:25 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 25 M ga-anọ n’ime ọgbakọ dị ukwuu too gị n’ihi ihe i mere;+M ga-emezu nkwa m n’ihu ndị na-atụ egwu ya.+ Jona 2:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Ma mụ onwe m ga-eji olu ekele m chụọrọ gị àjà.+M ga-emezu ihe m kwere ná nkwa.+ Ọ bụ Jehova nwe nzọpụta.”+ Nehọm 1:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 “Lee! N’elu ugwu ka ụkwụ onye na-eweta ozi ọma, bụ́ onye na-ekwusa udo,+ guzo. Juda, mee ememme+ gị dị iche iche. Kwụọ ihe i kwere ná nkwa;+ n’ihi na onye na-abaghị n’ihe agaghị esi na gị+ gafere ọzọ. A ga-ebipụ+ ya kpamkpam.” Matiu 5:33 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 33 “Ọzọ, unu nụrụ na a gwara ndị oge ochie, sị, ‘Aṅụla iyi+ n’emezughị ya, kama mezuo nkwa i kwere Jehova.’+ Jọn 17:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Emewo m ka ị dị ebube+ n’ụwa, ebe ọ bụ na arụchaala m ọrụ i nyere m ka m rụọ.+
25 M ga-anọ n’ime ọgbakọ dị ukwuu too gị n’ihi ihe i mere;+M ga-emezu nkwa m n’ihu ndị na-atụ egwu ya.+
9 Ma mụ onwe m ga-eji olu ekele m chụọrọ gị àjà.+M ga-emezu ihe m kwere ná nkwa.+ Ọ bụ Jehova nwe nzọpụta.”+
15 “Lee! N’elu ugwu ka ụkwụ onye na-eweta ozi ọma, bụ́ onye na-ekwusa udo,+ guzo. Juda, mee ememme+ gị dị iche iche. Kwụọ ihe i kwere ná nkwa;+ n’ihi na onye na-abaghị n’ihe agaghị esi na gị+ gafere ọzọ. A ga-ebipụ+ ya kpamkpam.”
33 “Ọzọ, unu nụrụ na a gwara ndị oge ochie, sị, ‘Aṅụla iyi+ n’emezughị ya, kama mezuo nkwa i kwere Jehova.’+