Matiu
5 Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, ọ rịgooro n’elu ugwu; mgbe ọ nọdụrụ ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya; 2 o wee meghee ọnụ ya malite izi ha ihe, sị:
3 “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha,+ n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.+
4 “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eru uju, n’ihi na a ga-akasi ha obi.+
5 “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi,+ n’ihi na ha ga-eketa ụwa.+
6 “Obi ụtọ na-adịrị ndị agụụ na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ+ maka ezi omume, n’ihi na a ga-eme ka afọ ju ha.+
7 “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme ebere,+ n’ihi na a ga-emere ha ebere.
8 “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị ọcha n’obi,+ n’ihi na ha ga-ahụ Chineke.+
9 “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme udo,+ n’ihi na a ga-akpọ ha ‘ụmụ+ Chineke.’
10 “Obi ụtọ na-adịrị ndị a kpagbuworo+ n’ihi ezi omume, n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.
11 “Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha+ unu ma na-akpagbu+ unu, na-aghagide unu ụgha, na-ekwukwa ụdị ihe ọjọọ niile megide unu n’ihi m. 12 Ṅụrịanụ ọṅụ, nweekwanụ obi ụtọ nke ukwuu,+ n’ihi na ụgwọ ọrụ+ unu dị ukwuu n’eluigwe; n’ihi na otú ahụ ka ha kpagburu ndị amụma+ bu unu ụzọ.
13 “Unu bụ nnu+ nke ụwa; ma ọ bụrụ na nnu adịkwaghị atọ ụtọ, olee otú a ga-esi mee ka ọ dịghachi ụtọ? A pụkwaghị iji ya mee ihe ọ bụla ma ọ́ bụghị ịwụfu ya n’èzí+ ka ndị mmadụ zọọ ya ụkwụ.
14 “Unu bụ ìhè nke ụwa.+ A pụghị izo obodo ezo ma ọ bụrụ na ọ dị n’elu ugwu. 15 Ndị mmadụ na-amụnye oriọna ma dọba ya, ọ bụghị n’okpuru nkata,+ kama n’elu ihe ndọba oriọna, ọ na-enwukwara ndị niile nọ n’ime ụlọ. 16 Otú ahụ, meenụ ka ìhè+ unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ, ka ha wee hụ ọrụ ọma unu+ wee nye Nna unu nọ n’eluigwe otuto.+
17 “Unu echela na m bịara ibibi Iwu ahụ+ ma ọ bụ ihe ndị amụma kụziri. M bịara, ọ bụghị ibibi ya, kama imezu ya;+ 18 n’ihi na n’ezie, ana m asị unu na ọ dị mfe eluigwe na ụwa ịgabiga+ karịa otu mkpụrụ akwụkwọ kasị nta ma ọ bụ otu akụkụ mkpụrụ akwụkwọ nke dị n’Iwu ahụ ịgabiga ma ọlị, ihe niile e dere n’ime ya agharakwa imezu.+ 19 Ya mere, onye ọ bụla nke na-emebi+ otu n’ime ihe ndị a kasị nta e nyere n’iwu ma na-akụziri ndị mmadụ ka ha na-eme otú ahụ, a ga-akpọ ya ‘onye kasị nta’ n’ihe banyere alaeze* eluigwe.+ Ma onye ọ bụla nke na-eme ha ma na-akụzi+ ha, a ga-akpọ onye a ‘onye ukwu’+ n’ihe banyere alaeze* eluigwe. 20 N’ihi na ana m asị unu na ọ bụrụ na ezi omume unu akarịghị nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii,+ unu agaghị aba+ n’alaeze eluigwe ma ọlị.
21 “Unu nụrụ na a gwara ndị oge ochie, sị, ‘Egbula ọchụ;+ ma onye ọ bụla nke gburu ọchụ+ ga-aza ajụjụ n’ụlọikpe.’+ 22 Otú ọ dị, ana m asị unu na onye ọ bụla nke na-eweso+ nwanne ya iwe ga-aza ajụjụ+ n’ụlọikpe; ma onye ọ bụla nke na-agwa nwanne ya okwu nlelị jọgburu onwe ya ga-aza ajụjụ n’Ụlọikpe Kasị Elu, onye ọ bụla nke na-asịkwa, ‘Gị onye nzuzu na-abaghị uru!’ a ga-atụba ya na Gehena* bụ́ ebe ọkụ na-ere.+
23 “Ya mere, ọ bụrụ na i ji onyinye gị gaa n’ebe ịchụàjà,+ i wee nọrọ n’ebe ahụ cheta na obi adịghị nwanne gị mma n’ebe ị nọ,+ 24 hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà gawa; buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo,+ mgbe ị bịaghachikwara, nye onyinye gị.+
25 “Mee ka gị na onye gbara gị akwụkwọ dozie okwu ọsọ ọsọ, mgbe gị na ya ka so na-aga n’ụlọikpe, ka onye ahụ gbara gị akwụkwọ+ wee ghara inyefe gị n’aka ọkàikpe, ọkàikpe ewee nyefee gị n’aka onye na-eje ozi n’ụlọikpe, e wee tụba gị n’ụlọ mkpọrọ. 26 N’eziokwu, ana m asị gị, Ị gaghị esi ebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụrụ mkpụrụ ego ikpeazụ nke ga-azụtali ihe dị nnọọ nta.+
27 “Unu nụrụ na a sịrị, ‘Akwala iko.’+ 28 Ma ana m asị unu na onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya,+ o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ,+ ọ kwasowo ya iko n’obi ya.+ 29 Ọ bụrụkwa na anya aka nri gị na-eme ka ị sụọ ngọngọ, ghụpụ ya tụfuo.+ N’ihi na ọ baara gị uru ka otu akụkụ ahụ́ gị laa n’iyi karịa na a tụbara ahụ́ gị dum+ na Gehena. 30 Ọ bụrụkwa na aka nri gị na-eme ka ị sụọ ngọngọ, gbubipụ ya tụfuo.+ N’ihi na ọ baara gị uru ka otu akụkụ ahụ́ gị laa n’iyi karịa na a tụbara ahụ́ gị dum na Gehena.
31 “A sịkwara, ‘Onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm,+ ya nye ya akwụkwọ ịgba alụkwaghịm.’+ 32 Otú ọ dị, ana m asị unu na onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma ọ́ bụghị n’ihi ịkwa iko,+ ọ na-eme ya ka ọ bụrụ onye nwere ike ịdaba n’ịkwa iko,+ onye ọ bụla nke lụkwara nwaanyị a gbara alụkwaghịm na-akwa iko.+
33 “Ọzọ, unu nụrụ na a gwara ndị oge ochie, sị, ‘Aṅụla iyi+ n’emezughị ya, kama mezuo nkwa i kwere Jehova.’+ 34 Otú ọ dị, ana m asị unu: Aṅụla iyi+ ma ọlị, ejikwala eluigwe aṅụ iyi, n’ihi na ọ bụ ocheeze Chineke;+ 35 ejikwala ụwa aṅụ iyi, n’ihi na ọ bụ ihe mgbakwasị+ ụkwụ ya; ejikwala Jeruselem aṅụ iyi, n’ihi na ọ bụ obodo+ nke Eze ukwu. 36 Ejikwala isi gị aṅụ iyi, n’ihi na ị pụghị ime ka otu ntutu chaa ọcha ma ọ bụ jie oji. 37 Naanị ka Ee unu kwuru bụrụ Ee, ka Ee e unu kwuru bụrụ Ee e;+ n’ihi na ihe karịrị ihe ndị a si n’aka ajọ onye ahụ.+
38 “Unu nụrụ na a sịrị, ‘Anya laara anya, ezé laakwara ezé.’+ 39 Otú ọ dị, ana m asị unu: Emegwarala onye bụ́ ajọ mmadụ ihe o mere gị; kama onye ọ bụla nke mara gị ụra na ntì aka nri,+ tụgharịkwaara ya nke ọzọ. 40 Ọ bụrụkwa na mmadụ achọọ ịkpụga gị n’ụlọikpe ka o wee nara gị uwe ime gị, hapụkwuoro ya uwe elu gị;+ 41 ọ bụrụkwa na onye nwere ikike amanye gị ịga otu maịl, soro ya gaa maịl abụọ.+ 42 Mmadụ rịọ gị ihe, nye ya, agbakụtakwala onye chọrọ ibite gị ihe n’akwụghị ọmụrụ nwa azụ.+
43 “Unu nụrụ na a sịrị, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya+ ma kpọọ onye iro gị asị.’+ 44 Otú ọ dị, ana m asị unu: Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya,+ na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu;+ 45 ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe,+ n’ihi na ọ na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.+ 46 N’ihi na ọ bụrụ na ọ bụ ndị hụrụ unu n’anya ka unu hụrụ n’anya, olee ụgwọ ọrụ unu nwere?+ Ọ̀ bụ na ndị ọnaụtụ adịghị eme otu ihe ahụ? 47 Ọ bụrụkwa na ọ bụ naanị ụmụnne unu ka unu na-ekele, olee oké ihe unu na-eme? Ọ̀ bụ na ndị mba ọzọ adịghị emekwa otu ihe ahụ? 48 Ya mere, unu aghaghị izu okè, dị ka Nna unu nke eluigwe zuru okè.+