34 N’ikpeazụ, Jefta lọtara Mizpa,+ n’ụlọ ya, ma, lee! ada ya kụụrụ obere ịgbà, gbara egwú+ na-apụta izute ya! Ọ bụ naanị otu nwa o nwere. E wezụga ya, o nweghị ma nwa nwoke ma nwa nwaanyị.
13 “N’oge ahụ, ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke na ụmụ okorobịa na ndị agadi ga-eji ọṅụ gbaa egwú.+ M ga-eme ka iru uju ha ghọọ ịṅụrị ọṅụ, m ga-akasi ha obi, meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ wee kwụsị iru uju.+